Amos 9

A ga-ebibi Izrel

1Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ guzo nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ọ sịrị,

“Tie ọnụ ogidi ndị a ihe,
ruo mgbe mbata ọnụ ụzọ ha niile mara jijiji.
Tipịasịa ha nʼisi mmadụ niile;
aga m ejikwa mma agha gbuo ndị niile fọdụrụ.
Ọ dịghị onye ga-agbapụ,
ọ dịkwaghị onye ga-ewezuga onwe ya.
2Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ,
site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha,
ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe,
site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala.
3Ọ bụrụkwa na ha ezoo onwe ha nʼelu Kamel
nʼebe ahụ ka m ga-esi chọpụta ha, kpụrụ ha,
a sịkwa na ha ezoo onwe ha nʼala oke osimiri,
nʼebe ahụ ka m ga-enye ajụala nke mmiri iwu ka ọ taa ha.
4Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ,
nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha.

“Aga m elekwasị ha anya m abụọ
nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.”

5Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee,
ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ;
ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl,
nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt.
6Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile,
na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa.
Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,
ma na-awụsa ha nʼala,
aha ya bụ Onyenwe anyị.

7“Ọ bụ na unu ndị Izrel
adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel,
site na Kafto kpọpụta ndị Filistia,
ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia?

8“Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị
nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie.
Aghaghị m ịla ya nʼiyi,
kpochapụ ya site nʼelu ụwa,
naanị na m agaghị ebibicha
ụlọ Jekọb kpamkpam.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
9“Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu,
aga m ayọgharị ụlọ Izrel
nʼetiti mba niile
dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ,
ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala.
10Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m,
ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị,
anyị agaghị ezute ya,
aghaghị ịnwụ site na mma agha.’

Nlọta ndị Izrel

11“Nʼụbọchị ahụ,

“aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa.
Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji,
mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ.
Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ.
12Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm
tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.”
Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya.
13“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,

“Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi,
onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa.
Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta,
ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.
14Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta.
Aga m emekwa ka ndị m Izrel nwetakwa ihe ọma niile.


“Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha.
Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya.
Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya.
15Aga m akụ Izrel nʼala ha.
Ya bụ, ime ka ha biri nʼala ha

A gaghị ehopukwa ha ọzọ
site nʼala ahụ bụ nke m nyere ha.”
Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Chineke unu kwuru.

Copyright information for IboBIU